1 Samuel 7

1Ya mere, ndị ikom Kiriat Jearim bịara buru igbe ọgbụgba ndụ
Igbe ọgbụgba ndụ ahụ dịgidere nʼebe a, ruo oge Devid bịara bulata ya na Jerusalem. 1Sa 6:21; Abụ 132:6; 2Sa 6:2-3
Onyenwe anyị bubata ya nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu. Ha doro Elieza, ọkpara Abinadab nsọ, ka ọ bụrụ onye na-elekọta igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

Mmeri Samuel meriri ndị Filistia na Mizpa

2Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị.
Eleghị anya nʼihi na Onyenwe anyị chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ.
3Ya mere, Samuel gwara ezinaụlọ Izrel niile sị, “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na alaghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ, wezuganụ chi niile nke ndị ala ọzọ, na arụsị Ashtọret site nʼetiti unu. Kpebienụ nʼobi unu ịbịakwute Onyenwe anyị, feekwa naanị ya ofufe. Ọ ga-anapụtakwa unu site nʼaka ndị Filistia.” 4Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị Onyenwe anyị.

5Samuel gwara ha sị, “Unu ndị Izrel, zukọtaanụ na Mizpa, ka m rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ nʼisi unu.” 6Mgbe ha niile zukọrọ nʼebe ahụ, ha kuuru mmiri wụpụ ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. Nʼụbọchị ahụ kwa, ha buru ọnụ, kwupụta mmehie sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị.” Ọ bụ na Mizpa ka Samuel malitere ikpe ụmụ Izrel ikpe.

7Mgbe ndị Filistia nụrụ na ụmụ Izrel zukọrọ na Mizpa, ndị eze ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha, bịa ibuso Izrel agha. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ na ha na-abịa nso, ha tụrụ ụjọ nke ukwuu. 8Ha sịrị Samuel, “Akwụsịla itiku Onyenwe anyị Chineke anyị mkpu akwa nʼihi anyị, kpeekwa ekpere ka ọ zọpụta anyị site nʼaka ndị Filistia.” 9Mgbe ahụ, Samuel weere nwa atụrụ na-aṅụ ara jiri ya chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, rịọkwa Onyenwe anyị ka o nyere Izrel aka. Onyenwe anyị zara ekpere ya.

10Nʼoge ahụ, mgbe Samuel nọ na-esure aja nsure ọkụ ahụ, ndị Filistia bịaruru nso ibuso Izrel agha, ma Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe were oke olu egbe eluigwe nke dara oke ụda chụsasịa ha. O mere ka ọgbaaghara bata nʼetiti ndị Filistia. Nke a mekwara ka ụmụ Izrel kpochapụ ha, 11Ndị ikom Izrel si na Mizpa pụta chụso ndị Filistia ọsọ, na-etigbu ha nʼụzọ ruo na ndịda Bet-Ka.

12Mgbe ahụ, Samuel weere otu nkume doo ya nʼagbata Mizpa na Shen, kpọọ ebe ahụ, Ebeneza, nke pụtara, “Nkume inyeaka,” nʼihi na ọ sịrị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyerela anyị aka ruo ugbu a.”

13Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel. 14E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait.
Ndị Amọrị bụ aha ọzọ eji mara ndị niile bụ ndị Kenan. Jen 14:5-7


15Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya. 16Afọ niile, ọ na-ejegharị site nʼotu obodo ruo nʼobodo ọzọ, site nʼobodo Betel ruo Gilgal, ruokwa Mizpa.
Betel, Gilgal na Mizpa bụ obodo atọ ndị so nʼoke ala Benjamin ketara. Ọ bụkwa na mpaghara ala ndị a, ka ụlọnsọ Chineke dị. Jos 18:11-28; Jos 4:19
Ọ na-anọkwa nʼobodo ndị a na-ekpe ndị Izrel ikpe.
17Ma ọ na-alọghachi na Rema, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka ụlọ ya dị. O kpekwara ndị Izrel ikpe nʼebe ahụ, wuokwara Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ.

Copyright information for IboBIU